Native Bible

1 Corinthians 16:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro.

1 Corinthians 16:4 in English

1 Corinthians 16:4 · Berean Standard Bible

And if it is advisable for me to go also, they can travel with me.

Context

2Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara. 3Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu. 4Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro. 5Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ Masidonia abịa. 6Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.