1 Ndị Kọrint 15:39
1 Corinthians 15:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha.
1 Corinthians 15:39 in English
1 Corinthians 15:39 · Berean Standard Bible
Not all flesh is the same: Men have one kind of flesh, animals have another, birds another, and fish another.
Context
37Mgbe ị na-agha mkpụrụ, ọ bụghị anụ ahụ nke ga-apụta ka ị na-agha, kama ọ bụ naanị mkpụrụ nkịtị, eleghị anya mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ mkpụrụ ọzọ. 38Ma Chineke na-enye ya ahụ dịka o si chọọ. Ọ na-enyekwa mkpụrụ ọbụla nʼime mkpụrụ niile ahụ nke kwesiri ya. 39Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha. 40Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa. Ma ịma mma na ebube nke ahụ nke eluigwe bụ otu, ịma mma na ebube nke ahụ nke ụwa dịkwa iche. 41Anyanwụ nwere ebube nke ya, ọnwa nwekwa nke ya, kpakpando nwekwara ebube nke ya. Kpakpando dịkwa iche site nʼibe ya nʼịma mma na ebube.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.