1 Ndị Kọrint 14:24
1 Corinthians 14:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie.
1 Corinthians 14:24 in English
1 Corinthians 14:24 · Berean Standard Bible
But if an unbeliever or uninstructed person comes in while everyone is prophesying, he will be convicted and called to account by all,
Context
22Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe. 23Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a? 24Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie. 25Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.” 26Ugbu a, ụmụnna m, kedụ otu o kwesiri ịdị? Mgbe ọbụla unu zukọrọ, ụfọdụ kwesiri ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe; maọbụ gwa unu ozi dị mkpa e gosiri ya, maọbụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọbụla e mere nʼime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-ewuli onye ọbụla elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.