1 Ndị Kọrint 12:4
1 Corinthians 12:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile.
1 Corinthians 12:4 in English
1 Corinthians 12:4 · Berean Standard Bible
There are different gifts, but the same Spirit.
Context
2Unu matara na mgbe unu bụ ndị na-amaghị Chineke, e duru unu nʼotu ụzọ maọbụ nke ọzọ, duhie unu ụzọ iso arụsị ndị ahụ dara ogbi. 3Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta nke ọma na ọ dịghị onye ọbụla na-ekwu okwu site nʼodudu Mmụọ nke Chineke, pụrụ ị sị, “Ka Jisọs bụrụ onye a bụrụ ọnụ.” Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ikwu, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” ma ọ bụghị site na Mmụọ Nsọ. 4Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile. 5E nwekwara ụdị ije ozi dị iche iche, maọbụ otu Onyenwe anyị ahụ ka a na-ejere ozi. 6Ụdị ike dị iche iche nke eji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a nʼime onye ọbụla iji jee ozi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.