1 Ndị Kọrint 12:21
1 Corinthians 12:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.”
1 Corinthians 12:21 in English
1 Corinthians 12:21 · Berean Standard Bible
The eye cannot say to the hand, “I do not need you.” Nor can the head say to the feet, “I do not need you.”
Context
19A sị na akụkụ niile dị nʼahụ bụ otu ihe, kedụ ebe ahụ ga-adị? 20Otu ọ dị, ọ bụ ezie na ihe dị nʼahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ. 21Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.” 22Kama ọ bụ akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụ ndị dị anyị mkpa karịa. 23E e, akụkụ ndị ahụ anyị na-eche na ha adịghị mkpa ka anyị na-eji nsọpụrụ na-elekọta. Akụkụ ndị ahụ na-ekwesighị ile anya ka anyị na-enye ugwu, ma na-ekpuchi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.