Native Bible

1 Corinthians 12:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ anụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ anụ ahụ.

1 Corinthians 12:16 in English

1 Corinthians 12:16 · Berean Standard Bible

And if the ear should say, “Because I am not an eye, I do not belong to the body,” that would not make it any less a part of the body.

Context

14Ahụ mmadụ abụghị naanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ ahụ. 15Ọ bụrụ na ụkwụ asị, “Nʼihi na-abụghị m aka, esoghị nʼahụ,” nke a agaghị egbochi ya ka ọ gharakwa ịbụ otu nʼakụkụ anụ ahụ. 16Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ anụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ anụ ahụ. 17Ọ bụrụ na ahụ niile bụ anya, olee ka ahụ ga-esi nụ ihe? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ naanị ntị ọ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọbụla? 18Ma otu ihe si dị, Chineke debere nʼotu nʼotu akụkụ niile dị nʼahụ dịka o si chọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.