1 Ndị Kọrint 10:22
1 Corinthians 10:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị na-achọ ime ka iwe wee Onyenwe anyị? Anyị dị ike karịa ya?
1 Corinthians 10:22 in English
1 Corinthians 10:22 · Berean Standard Bible
Are we trying to provoke the Lord to jealousy? Are we stronger than He?
Context
20Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu.* 21Unu apụghị ịṅụ site nʼiko Onyenwe anyị ma ṅụọkwa site nʼiko ekwensu; unu apụghịkwa inwe oke site na tebul Onyenwe anyị na tebul ekwensu. 22Anyị na-achọ ime ka iwe wee Onyenwe anyị? Anyị dị ike karịa ya? 23Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka. 24Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.