Native Bible

1 Corinthians 10:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu.

1 Corinthians 10:15 in English

1 Corinthians 10:15 · Berean Standard Bible

I speak to reasonable people; judge for yourselves what I say.

Context

13O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya. 14Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ. 15Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu. 16Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst? 17Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.