Native Bible

1 Corinthians 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.”

1 Corinthians 1:12 in English

1 Corinthians 1:12 · Berean Standard Bible

What I mean is this: Individuals among you are saying, “I follow Paul,” “I follow Apollos,” “I follow Cephas,”* or “I follow Christ.”

Context

10Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu. 11Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu. 12Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.” 13Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl? 14Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.