Native Bible

1 Corinthians 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu.

1 Corinthians 1:10 in English

1 Corinthians 1:10 · Berean Standard Bible

I appeal to you, brothers, in the name of our Lord Jesus Christ, that all of you agree together, so that there may be no divisions among you and that you may be united in mind and conviction.

Context

8Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi. 10Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu. 11Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu. 12Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.