Native Bible

1 Chronicles 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụọgụgụ ndị nchụaja lọtaranụ bụ otu puku na narị asaa, na iri isii (1,760). Ha niile bụkwa ndịisi ezinaụlọ, ndị tozuru etozu ịrụ ọrụ ha, ndị ọrụ ha bụ ije ozi nʼụlọnsọ Chineke.

1 Chronicles 9:13 in English

1 Chronicles 9:13 · Berean Standard Bible

and 1,760 of their relatives, the heads of their families, able men for the work of the service of the house of God.

Context

11Azaraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, na Meraiot, nwa Ahitub. Azaraya bụ onye na-elekọta ụlọnsọ ukwu Chineke. 12Ndị nchụaja ọzọ lọtaranụ bụ Adaya nwa Jeroham, nwa Pashua, nwa Malkija. Onye ọzọ bụ Maasai nwa Adiel, nwa Jazera, nwa Meshulam nwa Meshilemit, nwa Imea 13Ọnụọgụgụ ndị nchụaja lọtaranụ bụ otu puku na narị asaa, na iri isii (1,760). Ha niile bụkwa ndịisi ezinaụlọ, ndị tozuru etozu ịrụ ọrụ ha, ndị ọrụ ha bụ ije ozi nʼụlọnsọ Chineke. 14Ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya onye ikwu Merari. 15Bakbaka, Heresh, Galal, na Matanaya nwa Mika, nwa Zikri, nwa Asaf;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.