Native Bible

1 Chronicles 5:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara.

1 Chronicles 5:1 in English

1 Chronicles 5:1 · Berean Standard Bible

These were the sons of Reuben the firstborn of Israel. Though he was the firstborn, his birthright was given to the sons of Joseph son of Israel, because Reuben defiled his father’s bed. So he is not reckoned according to birthright.

Context

1Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara. 2Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara. 3Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a: Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.