1 Ihe E Mere 4:41
1 Chronicles 4:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ.
1 Chronicles 4:41 in English
1 Chronicles 4:41 · Berean Standard Bible
These who were noted by name came in the days of Hezekiah king of Judah. They attacked the Hamites and Meunites there in their dwellings, devoting them to destruction * even to this day. Then they settled in their place, because there was pasture for their flocks.
Context
39ha gakwara na mpụta Gedoa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ndagwurugwu ịchọrọ igwe anụ ụlọ ha ebe ịta nri. 40Ha chọtara ebe ịta ahịhịa anụ ụlọ mara mma, nke sara mbara, nke dị jụụ, bụrụkwa ebe nsogbu na-adịghị. Ụfọdụ nʼime ụmụ Ham ebiela nʼebe ahụ na mbụ. 41Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ. 42Ọzọkwa, narị ndị ikom ise nʼime ndị a si nʼebo Simiọn, ndị ndu ha bụ Pelataya, Nearaya, Refaya na Uziel, ụmụ Ishi busoro obodo ugwu ugwu Sia agha. 43Ha gburu ndị Amalek fọdụrụ ndụ nʼebe ahụ, bichie ala ahụ ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.