Native Bible

1 Chronicles 27:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).

1 Chronicles 27:8 in English

1 Chronicles 27:8 · Berean Standard Bible

The fifth, for the fifth month, was the commander Shamhuth * the Izrahite. There were 24,000 men in his division.

Context

6Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a. 7Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ. 8Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 9Onyeisi nkewa nke isii, maka ọnwa nke isii bụ Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, bụ onyeisi agha nkewa nke isii. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 10Onyeisi nkewa nke asaa, maka ọnwa nke asaa bụ Helez onye Pelon. Onye sitere nʼikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.