Native Bible

1 Chronicles 27:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ.

1 Chronicles 27:7 in English

1 Chronicles 27:7 · Berean Standard Bible

The fourth, for the fourth month, was Joab’s brother Asahel, and his son Zebadiah was commander after him. There were 24,000 men in his division.

Context

5Onyeisi nkewa nke atọ, maka ọnwa nke atọ bụ Benaya nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ọ bụ onyeisi, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 6Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a. 7Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ. 8Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 9Onyeisi nkewa nke isii, maka ọnwa nke isii bụ Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, bụ onyeisi agha nkewa nke isii. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.