Native Bible

1 Chronicles 27:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha.

1 Chronicles 27:27 in English

1 Chronicles 27:27 · Berean Standard Bible

Shimei the Ramathite was in charge of the vineyards. Zabdi the Shiphmite was in charge of the produce of the vineyards for the wine vats.

Context

25Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze. Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile. 26Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya. 27Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha. 28Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel. Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv. 29Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn. Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.