Native Bible

1 Chronicles 27:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyeisi nkewa nke iri na otu, maka ọnwa nke iri na otu bụ Benaya onye Piraton, nke ikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).

1 Chronicles 27:14 in English

1 Chronicles 27:14 · Berean Standard Bible

The eleventh, for the eleventh month, was Benaiah the Pirathonite, an Ephraimite. There were 24,000 men in his division.

Context

12Onyeisi nkewa nke itoolu, maka ọnwa nke itoolu bụ Abieza onye Anatot. Onye sitere nʼikwu Benjamin. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 13Onyeisi nkewa nke iri, maka ọnwa nke iri bụ Maharai onye Netofa, site nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 14Onyeisi nkewa nke iri na otu, maka ọnwa nke iri na otu bụ Benaya onye Piraton, nke ikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 15Onyeisi nkewa nke iri na abụọ, maka ọnwa nke iri na abụọ bụ Heldai onye Netofa. Onye sitere nʼezinaụlọ Otniel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 16Ndị a bụ ndị ndu ebo Izrel niile: Elieza nwa Zikri bụ onyendu ndị Ruben; Shefataya nwa Maaka bụ onyendu ndị Simiọn;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.