1 Ihe E Mere 26:32
1 Chronicles 26:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.
1 Chronicles 26:32 in English
1 Chronicles 26:32 · Berean Standard Bible
Among Jerijah’s relatives there were 2,700 capable men who were heads of families. King David appointed them over the Reubenites, the Gadites, and the half-tribe of Manasseh for every matter pertaining to God and to the affairs of the king.
Context
30Site na ndị Hebrọn,
Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka. 31Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi.
Nʼihi na nʼafọ nke iri anọ nke ọchịchị eze Devid nʼIzrel, ka e mere nnyocha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ chọpụta na e nwere ndị dị ike ọrụ nʼetiti ndị Hebrọn. A chọpụtara ndị a nʼobodo Jeza nke dị na Gilead. 32Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.