Native Bible

1 Chronicles 26:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.

1 Chronicles 26:28 in English

1 Chronicles 26:28 · Berean Standard Bible

Everything that had been dedicated by Samuel the seer, Saul son of Kish, Abner son of Ner, and Joab son of Zeruiah, along with everything else that was dedicated, was under the care of Shelomith and his brothers.

Context

26Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ. 27Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 28Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha. 29Site nʼikwu Izha, Kenaniya, na ụmụ ndị ikom ya ka ozi dịrị pụọ nʼụlọnsọ, dịka ndịisi na ndị ikpe nye ndị Izrel. 30Site na ndị Hebrọn, Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.