1 Ihe E Mere 26:25
1 Chronicles 26:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụnna ya site na Elieza bụ ndị a, Rehabaya nwa ya nwoke, Jeshaya nwa nwoke Rehabaya, Joram nwa nwoke Jeshaya na Zikri nwa nwoke Shelomit.
1 Chronicles 26:25 in English
1 Chronicles 26:25 · Berean Standard Bible
His relatives through Eliezer included Rehabiah his son, Jeshaiah * his son, Joram his son, Zichri his son, and Shelomith his son.
Context
23Site na ndị Amram, na ndị Izha, na ndị Hebrọn, na ndị Uziel. 24Shubuel nwa Geshọm, na nwa nwa Mosis ka e nyere ọrụ ịbụ onyeisi ụlọakụ dị nʼụlọnsọ ahụ. 25Ụmụnna ya site na Elieza bụ ndị a, Rehabaya nwa ya nwoke, Jeshaya nwa nwoke Rehabaya, Joram nwa nwoke Jeshaya na Zikri nwa nwoke Shelomit. 26Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ. 27Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.