Native Bible

1 Chronicles 23:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ.

1 Chronicles 23:3 in English

1 Chronicles 23:3 · Berean Standard Bible

The Levites thirty years of age or older were counted, and the total number of men was 38,000.

Context

1Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel. 2Nʼoge a, ọ kpọkọtara ndị ndu Izrel niile, tinyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị. 3A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ. 4Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe, 5puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito Onyenwe anyị, na-eto ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.