Native Bible

1 Chronicles 21:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab. Ya mere, Joab pụrụ gagharịa nʼIzrel niile, mechaa lọghachikwa na Jerusalem.

1 Chronicles 21:4 in English

1 Chronicles 21:4 · Berean Standard Bible

Nevertheless, the king’s word prevailed against Joab. So Joab departed and traveled throughout Israel, and then he returned to Jerusalem.

Context

2Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.” 3Ma Joab zaghachiri, “Ka Onyenwe anyị mee ka ndị agha ya mụbaa, otu onye narị ụzọ karịa. Ma onyenwe m eze, ọ bụ na ndị a niile abụghị ndị nọ nʼokpuru ọchịchị onyenwe m? Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achọ ime ihe a? Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji wetara Izrel ikpe ọmụma?” 4Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab. Ya mere, Joab pụrụ gagharịa nʼIzrel niile, mechaa lọghachikwa na Jerusalem. 5Joab nyere Devid ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel niile. NʼIzrel niile, ha dị otu nde, na narị puku ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, tinyekwara narị puku ndị ikom anọ na iri asaa nʼala Juda ndị na-amịpụta mma agha. 6Ma Joab agụnyeghị ndị Livayị, na ndị Benjamin nʼọnụọgụgụ ahụ, nʼihi na iwu eze amasịghị ya nʼobi nʼụzọ ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.