1 Ihe E Mere 21:2
1 Chronicles 21:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”
1 Chronicles 21:2 in English
1 Chronicles 21:2 · Berean Standard Bible
So David said to Joab and the commanders of the troops, “Go and count the Israelites from Beersheba to Dan and bring me a report, so that I may know their number.”
Context
1Ekwensu biliri megide Izrel, mgbe ọ kpaliri Devid ka ọ gụọ Izrel ọnụ. 2Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.” 3Ma Joab zaghachiri, “Ka Onyenwe anyị mee ka ndị agha ya mụbaa, otu onye narị ụzọ karịa. Ma onyenwe m eze, ọ bụ na ndị a niile abụghị ndị nọ nʼokpuru ọchịchị onyenwe m? Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achọ ime ihe a? Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji wetara Izrel ikpe ọmụma?” 4Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab. Ya mere, Joab pụrụ gagharịa nʼIzrel niile, mechaa lọghachikwa na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.