Native Bible

1 Chronicles 21:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya Onyenwe anyị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”

1 Chronicles 21:24 in English

1 Chronicles 21:24 · Berean Standard Bible

“No,” replied King David, “I insist on paying the full price, for I will not take for the LORD what belongs to you, nor will I offer burnt offerings that cost me nothing.”

Context

22Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.” 23Ma Arauna zara sị Devid, “Were ya ka onyenwe m eze mee ihe ọbụla dị ya nʼobi. Aga m enye ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, ihe nzọcha ọka niile ka ha bụrụ nkụ na ọka wiiti maka ịchụ aja mkpụrụ ọka. Aga m enye ha niile.” 24Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya Onyenwe anyị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.” 25Ya mere, Devid kwụrụ Arauna narị shekel ọlaedo isii iji zụrụ ebe ahụ. 26Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ, chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zakwara ya, site nʼọkụ nke si nʼeluigwe daa nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.