Native Bible

1 Chronicles 21:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.”

1 Chronicles 21:22 in English

1 Chronicles 21:22 · Berean Standard Bible

Then David said to Ornan, “Grant me the site of this threshing floor, that I may build an altar to the LORD. Sell it to me for the full price, so that the plague upon the people may be halted.”

Context

20Mgbe Arauna nọ nʼebe ịzọcha ọka, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ, ụmụ ya ndị ikom anọ ndị so ya guzo nʼebe ahụ zoro onwe ha. 21Mgbe Devid bịakwutere Arauna, Arauna weliri anya hụ ya, ọ hapụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ, bịa kpọọ isiala nye Devid, kpudokwa ihu ya nʼala. 22Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.” 23Ma Arauna zara sị Devid, “Were ya ka onyenwe m eze mee ihe ọbụla dị ya nʼobi. Aga m enye ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, ihe nzọcha ọka niile ka ha bụrụ nkụ na ọka wiiti maka ịchụ aja mkpụrụ ọka. Aga m enye ha niile.” 24Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya Onyenwe anyị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.