1 Ihe E Mere 20:1
1 Chronicles 20:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Joab duuru ndị agha pụọ ibu agha. O bibiri ala ndị Amọn niile, gaa Raba nọchibido ya, ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. Joab busoro Raba agha, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe.
1 Chronicles 20:1 in English
1 Chronicles 20:1 · Berean Standard Bible
In the spring,* at the time when kings march out to war, Joab led out the army and ravaged the land of the Ammonites. He came to Rabbah and besieged it, but David remained in Jerusalem. And Joab attacked Rabbah and demolished it.
Context
1Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Joab duuru ndị agha pụọ ibu agha. O bibiri ala ndị Amọn niile, gaa Raba nọchibido ya, ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. Joab busoro Raba agha, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. 2Devid kpupuru okpueze nke dị eze ha nʼisi, ahụtara nʼịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma, e kpunyere ya Devid nʼisi. O sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 3Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala, na anyụike na-arụ. Otu a ka Devid mekwara obodo niile nke ndị Amọn. Emesịa, Devid na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.