Native Bible

1 Chronicles 19:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, pụọ gafee Jọdan. O gara nso imegide ha, o doro usoro agha ya na ncherita ihu ha. Devid doro usoro ndị agha ya izute ndị Aram nʼagha, ha lụsokwara ya agha.

1 Chronicles 19:17 in English

1 Chronicles 19:17 · Berean Standard Bible

When this was reported to David, he gathered all Israel, crossed the Jordan, advanced toward the Arameans, and arrayed for battle against them. When David lined up to engage them in battle, they fought against him.

Context

15Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwaara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab laghachiri na Jerusalem. 16Ma mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha, ha zipụrụ ndị ozi gara kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ọ bụ Shofaka ọchịagha ndị agha Hadadeza na-edu ha. 17Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, pụọ gafee Jọdan. O gara nso imegide ha, o doro usoro agha ya na ncherita ihu ha. Devid doro usoro ndị agha ya izute ndị Aram nʼagha, ha lụsokwara ya agha. 18Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ. Devid gburu puku asaa nʼime ndị ikom na-anya ụgbọ agha, gbukwaa iri puku ndị agha anọ ndị na-eji ụkwụ eje. O gbukwara Shofaka, bụ ọchịagha agha ha. 19Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na Devid dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ya. Ya mere, ndị Aram adịghịkwa njikere inyere ụmụ Amọn aka ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.