1 Ihe E Mere 19:15
1 Chronicles 19:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwaara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab laghachiri na Jerusalem.
1 Chronicles 19:15 in English
1 Chronicles 19:15 · Berean Standard Bible
When the Ammonites saw that the Arameans had fled, they too fled before Joab’s brother Abishai, and they entered the city. So Joab went back to Jerusalem.
Context
13Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.” 14Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ. 15Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwaara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab laghachiri na Jerusalem. 16Ma mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha, ha zipụrụ ndị ozi gara kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ọ bụ Shofaka ọchịagha ndị agha Hadadeza na-edu ha. 17Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, pụọ gafee Jọdan. O gara nso imegide ha, o doro usoro agha ya na ncherita ihu ha. Devid doro usoro ndị agha ya izute ndị Aram nʼagha, ha lụsokwara ya agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.