Native Bible

1 Chronicles 17:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,

1 Chronicles 17:9 in English

1 Chronicles 17:9 · Berean Standard Bible

And I will provide a place for My people Israel and will plant them so that they may dwell in a place of their own and be disturbed no more. No longer will the sons of wickedness oppress them as they did at the beginning

Context

7“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị, mee gị onye na-achị ndị m Izrel. 8Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa. 9Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ, 10dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m eme ka ndị iro gị niile nọrọ nʼokpuru gị. “ ‘Ana m ekwupụtara gị na Onyenwe anyị ga-ewuru gị ụlọ. 11Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.