1 Ihe E Mere 17:11
1 Chronicles 17:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.
1 Chronicles 17:11 in English
1 Chronicles 17:11 · Berean Standard Bible
And when your days are fulfilled and you go to be with your fathers, I will raise up your descendant after you, one of your own sons, and I will establish his kingdom.
Context
9Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ, 10dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m eme ka ndị iro gị niile nọrọ nʼokpuru gị.
“ ‘Ana m ekwupụtara gị na Onyenwe anyị ga-ewuru gị ụlọ. 11Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. 12Ọ bụ ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ, aga m emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 13Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna, ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Agaghị m ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m mere onye bu gị ụzọ chịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.