Native Bible

1 Chronicles 15:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị.

1 Chronicles 15:23 in English

1 Chronicles 15:23 · Berean Standard Bible

Berechiah and Elkanah were to be guardians * of the ark.

Context

21Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị. 22Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ. 23Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị. 24Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche. 25Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.