1 Ihe E Mere 12:14
1 Chronicles 12:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha.
1 Chronicles 12:14 in English
1 Chronicles 12:14 · Berean Standard Bible
These Gadites were army commanders, the least of whom was a match for a hundred, and the greatest for a thousand.
Context
12na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu, 13na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu. 14Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha. 15Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. 16Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.