1 Ihe E Mere 10:9
1 Chronicles 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha yipụrụ ya ihe niile oyi, buru isi ya na ihe agha ya, zipụkwa ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nye ndị ha niile na arụsị ha niile.
1 Chronicles 10:9 in English
1 Chronicles 10:9 · Berean Standard Bible
They stripped Saul, cut off his head, took his armor, and sent messengers throughout the land of the Philistines to proclaim the news in the temple of their idols and among their people.
Context
7Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha. 8Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa. 9Ha yipụrụ ya ihe niile oyi, buru isi ya na ihe agha ya, zipụkwa ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nye ndị ha niile na arụsị ha niile. 10Ha tinyere ihe agha ya nʼụlọ chi ha, kwụbakwa okpokoro isi ya nʼụlọ Dagọn. 11Mgbe ndị Jebesh Gilead niile nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.