1 Ihe E Mere 10:12
1 Chronicles 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, biliri gaa buru ozu Sọl na ụmụ ya, bulata ha na Jebesh. Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi ukwu dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.
1 Chronicles 10:12 in English
1 Chronicles 10:12 · Berean Standard Bible
all their men of valor set out and retrieved the bodies of Saul and his sons and brought them to Jabesh. And they buried their bones under the oak * in Jabesh and fasted seven days.
Context
10Ha tinyere ihe agha ya nʼụlọ chi ha, kwụbakwa okpokoro isi ya nʼụlọ Dagọn. 11Mgbe ndị Jebesh Gilead niile nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl, 12ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, biliri gaa buru ozu Sọl na ụmụ ya, bulata ha na Jebesh. Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi ukwu dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa. 13Sọl nwụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị, o debeghị okwu Onyenwe anyị, karịsịa, ọ gara na nke onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, nʼihi ịjụta ya ase, 14ma ọ jụghị ase site nʼọnụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere Onyenwe anyị ji gbuo ya, were alaeze ya nyefee Devid nwa Jesi nʼaka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.