Native Bible

Zechariah 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị sị,

Zechariah 4:8 in English

Zechariah 4:8 · Berean Standard Bible

Then the word of the LORD came to me, saying,

Context

6Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 7“Gịnị ka ị bụ, gị ugwu dị ukwuu? Ị ga-aghọ ala dị larịị nʼihu Zerubabel. Mgbe ahụ, ọ ga-awapụta isi nkume ahụ site nʼiti oke mkpu ọṅụ, ‘Amara! Amara dịrị ya!’ ” 8Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị sị, 9“Zerubabel wara ntọala ụlọnsọ ukwu a, ọ bụ ya ga-ewuchakwa ya. Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. 10“Onye na-eleda ụbọchị ihe nta anya ebe ọ bụ nʼanya asaa nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ejegharị na-elezu ụwa dum, ga-aṅụ ọṅụ mgbe ha hụrụ nkume eji atụ mgbidi nʼaka Zerubabel?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.