Zekaraya 14:5
Zechariah 14:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-esi na ndagwurugwu nke ugwu m ahụ gbalaga, nʼihi na ndagwurugwu ahụ ga-eru Azel. Unu ga-agbapụ dịka unu si gbapụ nʼoge gara aga, mgbe ala ọma jijiji ahụ, nʼoge Uzaya bụ eze Juda. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ ya.
Zechariah 14:5 in English
Zechariah 14:5 · Berean Standard Bible
You will flee by My mountain valley, for it will extend to Azal. You will flee as you fled from the earthquake in the days of Uzziah king of Judah. Then the LORD my God will come, and all the holy ones with Him.*
Context
3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha. 4Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda. 5Unu ga-esi na ndagwurugwu nke ugwu m ahụ gbalaga, nʼihi na ndagwurugwu ahụ ga-eru Azel. Unu ga-agbapụ dịka unu si gbapụ nʼoge gara aga, mgbe ala ọma jijiji ahụ, nʼoge Uzaya bụ eze Juda. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ ya. 6Nʼụbọchị ahụ, ìhè anyanwụ agaghị adị, oyi agaghị adị, mkpụrụ mmiri agaghị adịkwa. 7Ọ ga-abụ ụbọchị pụrụ iche, ụbọchị ehihie na abalị na-agaghị adịkwa. Ọ bụ ụbọchị nke naanị Onyenwe anyị maara. Ma ìhè ga-adịkwa nʼoge anyasị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.