Native Bible

Zechariah 14:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, mgbe a ga-ekesa ihe nkwata gị niile nʼetiti mgbidi gị.

Zechariah 14:1 in English

Zechariah 14:1 · Berean Standard Bible

Behold, a day of the LORD is coming when your plunder will be divided in your presence.

Context

1Lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, mgbe a ga-ekesa ihe nkwata gị niile nʼetiti mgbidi gị. 2Aga m achịkọta mba niile ka ha bịa Jerusalem ibuso ya agha. Ha ga-adọta obodo ahụ nʼagha, tụtụkọọ ihe dị nʼụlọ niile, dinaa ndị inyom nʼike. A ga-adọta ọkara ndị bi nʼobodo ahụ nʼagha, duru ha gaa mba ọzọ. Ma ọkara nke ọzọ ka ha ga-ahapụ. 3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.