Zekaraya 12:8
Zechariah 12:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-echebe ndị bi na Jerusalem, mee ka ọ bụladị ndị na-asọ ngọngọ nʼetiti ha dịrị ike dịka Devid. Ụlọ Devid ga-adịkwa ka Chineke, dịka Mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye na-eje nʼihu ha.
Zechariah 12:8 in English
Zechariah 12:8 · Berean Standard Bible
On that day the LORD will defend the people of Jerusalem, so that the weakest among them will be like David, and the house of David will be like God, like the angel * of the LORD going before them.
Context
6“Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka ndị ndu Juda niile dịrị ka ite ọkụ, nke a dọnyere nʼebe a chịkọtara nkụ. Ha ga-adịkwa ka ọkụ na-enwu enwu, nke dị nʼetiti ukwu ọka. Ha ga-ere ọkụ nʼaka nri na nʼaka ekpe, rechapụ ndị niile bi gburugburu ha. Ma mmadụ ga-ejupụtakwa nʼime Jerusalem. 7“Onyenwe anyị ga-ebu ụzọ zọpụta ebe obibi niile nke Juda, ime ka ugwu na nsọpụrụ nke ụlọ Devid, na nke ndị niile bi na Jerusalem ghara ịdị ukwuu karịa nke Juda. 8Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-echebe ndị bi na Jerusalem, mee ka ọ bụladị ndị na-asọ ngọngọ nʼetiti ha dịrị ike dịka Devid. Ụlọ Devid ga-adịkwa ka Chineke, dịka Mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye na-eje nʼihu ha. 9Nʼụbọchị ahụ, aga m ebido ibibi mba ndị ahụ niile na-ebuso Jerusalem agha. 10“Mgbe ahụ, aga m awụkwasị nʼụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem, mmụọ nke amara na nke arịrịọ amara. Ha ga-elegidekwa m anya, bụ onye ahụ ha mapuru ahụ. Ha ga-eru ụjụ nʼihi ya, dịka mmadụ si eru ụjụ nʼihi ọnwụ nke nwa a mụrụ naanị ya. Ha ga-ebekwa akwa ilu nke ukwuu dịka mmadụ sị ebe akwa maka nwa mbụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.