Zekaraya 11:7
Zechariah 11:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, azụrụ m igwe ewu na atụrụ ndị ahụ a ga-egbu egbu, nke ka nke, ndị ahụ a na-emegbu emegbu. Eweere m mkpanaka abụọ, kpọọ otu nʼime ha Amara, kpọọ nke ọzọ Ịdị nʼotu. Azụkwara m igwe atụrụ ndị ahụ.
Zechariah 11:7 in English
Zechariah 11:7 · Berean Standard Bible
So I pastured the flock marked for slaughter, especially the afflicted of the flock. Then I took for myself two staffs, calling one Favor and the other Union, and I pastured the flock.
Context
5Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha ma ọ dịghị ahụhụ na-abịakwasị ha. Ndị na-erekwa ha na-asị, ‘Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na abụ m ọgaranya.’ Ndị ọzụzụ ha adịghị enwe ọmịiko nʼahụ ha. 6Nʼihi na mụ onwe m agakwaghị egosi ndị ala a obi ebere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m ewere onye ọbụla nʼime ha nyefee nʼaka onye agbataobi ya, na nʼaka eze ha. Ha ga-ebibi ala a kpamkpam, ma mụ onwe m agaghị anapụta onye ọbụla site nʼaka ha.” 7Nʼihi ya, azụrụ m igwe ewu na atụrụ ndị ahụ a ga-egbu egbu, nke ka nke, ndị ahụ a na-emegbu emegbu. Eweere m mkpanaka abụọ, kpọọ otu nʼime ha Amara, kpọọ nke ọzọ Ịdị nʼotu. Azụkwara m igwe atụrụ ndị ahụ. 8Nʼime otu ọnwa, ewezugara m ndị ọzụzụ atụrụ atọ.
Igwe ewu na atụrụ ndị ahụ kpọkwazịrị m asị, enwezighị m ike nweere ha ndidi. 9Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.