Zekaraya 11:11
Zechariah 11:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị.
Zechariah 11:11 in English
Zechariah 11:11 · Berean Standard Bible
It was revoked on that day, and so the afflicted of the flock who were watching me knew that it was the word of the LORD.
Context
9Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.” 10Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara. 11Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị. 12Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ. 13Onyenwe anyị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.