Zekaraya 1:7
Zechariah 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị:
Zechariah 1:7 in English
Zechariah 1:7 · Berean Standard Bible
On the twenty-fourth day of the eleventh month, the month of Shebat,* in the second year of Darius, the word of the LORD came to the prophet Zechariah son of Berechiah, the son of Iddo.
Context
5Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? 6Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ?
“Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’ ” 7Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị: 8Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa. 9Ajụrụ m, “Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?”
Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu sịrị m, “Aga m egosi gị ihe ha bụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.