Native Bible

Titus 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebe ị ma na onye dị otu a bụ onye ndahie na onye ajọọ omume, o jirila aka ya maa onwe ya ikpe.

Titus 3:11 in English

Titus 3:11 · Berean Standard Bible

knowing that such a man is corrupt and sinful; he is self-condemned.

Context

9Ma zere ịrụ ụka nzuzu na ịgụ agbụrụ ọmụmụ, esemokwu niile, na ọgụ niile ndị mmadụ na-alụ banyere iwu. Ihe ndị a niile abaghị uru ọbụla, ha bụ ihe efu. 10Gbasara onye na-akpa oke, ị dụchaa ya ọdụ ihe dịka otu ugboro maọbụ abụọ, leghara ya anya. 11Ebe ị ma na onye dị otu a bụ onye ndahie na onye ajọọ omume, o jirila aka ya maa onwe ya ikpe. 12Ana m akwado izitere gị Atemas maọbụ Taịkikọs. Gbalịa bịakwute m na Nikopolis, maka nʼebe ahụ ka m kpebiri ịnọ nʼoge oyi. 13Gbaa mbọ zipụ Zenas bụ onye ọkaikpe, na Apọlọs, ngwangwa nʼije ha. Hụkwa na ha ji ihe niile dị ha mkpa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.