Rut 4:14
Ruth 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile.
Ruth 4:14 in English
Ruth 4:14 · Berean Standard Bible
Then the women said to Naomi, “Blessed be the LORD, who has not left you this day without a kinsman-redeemer. May his name become famous in Israel.
Context
12Site nʼụmụ Onyenwe anyị ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez* onye Tama mụụrụ Juda.” 13Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke. 14Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile. 15Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.” 16Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.