Rut 4:11
Ruth 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị okenye na ndị niile nọ nʼọnụ ụzọ ama kwuru sị, “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Onyenwe anyị mee nwanyị a na-abata nʼezinaụlọ gị ka ọ dịrị ka Rechel na Lịa,* ndị ebo Izrel niile sitere na ha pụta! Ka ị bụrụkwa ọgaranya nʼagbụrụ Efrata, ghọọkwa onye a ma ama na Betlehem.
Ruth 4:11 in English
Ruth 4:11 · Berean Standard Bible
“We are witnesses,” said the elders and all the people at the gate. “May the LORD make the woman entering your home like Rachel and Leah, who together built up the house of Israel. May you be prosperous in Ephrathah and famous in Bethlehem.
Context
9Mgbe ahụ, Boaz kwupụtara na ntị ndị okenye ndị ahụ na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Unu bụ ndị akaebe na esitela m nʼaka Naomi zụrụ ala niile Elimelek, na Kilịọn na Mahlọn nwere. 10Azụrụkwala m Rut onye Moab, nwunye Mahlọn ka ọ bụrụ nwunye m, ime ka aha onye nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide, ka aha ha hapụ ifu nʼetiti ndị ikwu ya maọbụ site nʼobodo ebe amụrụ ya. Taa unu niile bụ ndị akaebe m.” 11Mgbe ahụ, ndị okenye na ndị niile nọ nʼọnụ ụzọ ama kwuru sị, “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Onyenwe anyị mee nwanyị a na-abata nʼezinaụlọ gị ka ọ dịrị ka Rechel na Lịa,* ndị ebo Izrel niile sitere na ha pụta! Ka ị bụrụkwa ọgaranya nʼagbụrụ Efrata, ghọọkwa onye a ma ama na Betlehem. 12Site nʼụmụ Onyenwe anyị ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez* onye Tama mụụrụ Juda.” 13Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.