Ruth 4:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Boaz pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ, nọdụ ala nʼebe ahụ. Ọ dịghị anya onye mgbapụta ahụ dị nso nke Boaz kwuru okwu banyere ya si nʼebe ahụ na-agafe. Boaz kpọrọ ya sị, “Enyi m bịa nọdụ ala.” Ọ bịara nọdụ ala.
Ruth 4:1 in English
Ruth 4:1 · Berean Standard Bible
Meanwhile, Boaz went to the gate and sat down there. Soon the kinsman-redeemer * of whom he had spoken came along, and Boaz said, “Come over here, my friend, and sit down.” So he went over and sat down.
Context
1Ya mere, Boaz pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ, nọdụ ala nʼebe ahụ. Ọ dịghị anya onye mgbapụta ahụ dị nso nke Boaz kwuru okwu banyere ya si nʼebe ahụ na-agafe. Boaz kpọrọ ya sị, “Enyi m bịa nọdụ ala.” Ọ bịara nọdụ ala. 2Boaz kpọrọ mmadụ iri, ndị bụ ndị okenye obodo ahụ, gwa ha, “Nọdụnụ ala nʼebe a.” Ha mere otu ahụ. 3Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.