Ruth 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya.
Ruth 3:6 in English
Ruth 3:6 · Berean Standard Bible
So she went down to the threshing floor and did everything her mother-in-law had instructed her to do.
Context
4Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.” 5Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.” 6Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya. 7Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya. 8Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.