Native Bible

Ruth 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka.

Ruth 3:2 in English

Ruth 3:2 · Berean Standard Bible

Now is not Boaz, with whose servant girls you have been working, a relative of ours? In fact, tonight he is winnowing barley on the threshing floor.

Context

1Otu ụbọchị, Naomi, nne di Rut, gwara ya okwu sị, “Nwa m nwanyị, ọ bụ na o rubeghị mgbe m ga-achọtara gị ụlọ nke aka gị, ebe a ga-anọ lekọtazie gị anya nke ọma? 2Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka. 3Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka,* ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. 4Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.