Rut 2:21
Ruth 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ”
Ruth 2:21 in English
Ruth 2:21 · Berean Standard Bible
Then Ruth the Moabitess said, “He also told me, ‘Stay with my young men until they have finished gathering all my harvest.’”
Context
19Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.”
Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.” 20Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”* 21Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ” 22Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.” 23Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.
2:2 Ị tụtụkọta ọka ndị a hapụrụ mgbe a na-ewe ihe ubi, bụ oke ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei na ndị ọbịa. Lev 19:9; Dit 24:19
2:14 Ọ bụ mmanya gbara ụka a wụnyere mmanụ ntakịrị, ka e ji emepụta mmanya viniga.
2:20 Onye mgbapụta anyị Onye dị otu a, aghaghị ịbụ onye metụtara nwoke ahụ nwụrụ anwụ. O nwere ike bụrụ nwanne ya maọbụ nwanna ya. Ọ bụ ya ka ọ dịrị dịka iwu ahụ si dị, inwetaghachi maọbụ zụghachite ala niile nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Iwu ahụ bụ, na onye mgbapụta a dị nso, ga-alụ nwunye nwanne maọbụ nwanna ya ahụ nwụrụ anwụ, ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa. Dit 25:5-10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.