Native Bible

Ruth 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Ọpa na Rut zara Naomi sị ya, “E, anyị agaghị ala. Anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị gị.”

Ruth 1:10 in English

Ruth 1:10 · Berean Standard Bible

and said, “Surely we will return with you to your people.”

Context

8Mgbe ahụ, Naomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ okwu sị ha, “Ngwa, onye ọbụla nʼime unu laghachi nʼụlọ nne ya.* Ka Onyenwe anyị gosi unu obiọma dịka unu si gosi mụ onwe m, na ndị unu nwụrụ anwụ. 9Ka Onyenwe anyị nyekwa unu di ọzọ ma meekwa ka unu chọta udo nʼezinaụlọ ọzọ.” Mgbe ahụ Naomi suturu ha ọnụ, ha niile kwara akwa. 10Ma Ọpa na Rut zara Naomi sị ya, “E, anyị agaghị ala. Anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị gị.” 11Naomi zara sị ha, “Laghachinụ ụmụ m, ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ga-eji soro m laa? E nwere m ike ịmụta ụmụ ndị ikom ọzọ ndị ga-abụ di unu?* 12Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.