Ndị Rom 8:3
Romans 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ.
Romans 8:3 in English
Romans 8:3 · Berean Standard Bible
For what the law was powerless to do in that it was weakened by the flesh, God did by sending His own Son in the likeness of sinful man, as an offering for sin.* He thus condemned sin in the flesh,
Context
1Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst. 2Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ. 3Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ. 4Ka izu ezu nke ihe niile iwu chọrọ nʼaka anyị bụrụ ihe e mezuru nʼime anyị, bụ ndị na-adịghị ebi ndụ dịka ọchịchọ anụ ahụ si dịrị, kama dịka ọchịchọ Mmụọ Nsọ si dị. 5Ndị niile na-ebi ndụ ha dịka anụ ahụ siri chọọ, na-ebi ya naanị imezu agụụ niile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị niile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Mmụọ na-achọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.